Podcast: Effect of longer-term modest salt reduction on blood pressure - Igbo

    Effect of longer-term modest salt reduction on blood pressure

    (Iwedata aka n'iri nnu na-ewedata obara iri elu) - Igbo translation

Obara mgbali elu bu otu nsogbu ahuike otutu ndi Naijiria na-enwekari.  Nchoputa egosila na iribiga nnu oke bu otu n’ime ihe ndi kachasi ebutere ndi okenye obara mgbali elu. Ozi a bu ka mmadu niile mata na iwedata aka n’iri nnu na-ewetu ogo obara mgbali elu. Ntuziaka otu n’ahu maka ahuike mba uwa nyere, bu na o di ezigbote mkpa ka-ewedata aka n’otu e si etinye nnu na nri. Nchoputa di iche iche nke ndi Oka mmuta mere, gosiri na iwedata aka n’itinye nnu na nri ga-enye aka butuo ma gbochiekwa obara mgbali elu.

Iwedata aka n’iri nnu, na-enye aka n’iwedata obara mgbali elu ma kwadokwa ahuike onye obula, n’agbayeghi ma o bu onye ocha, onye ojii, nwoke ma o bu kwa nwanyi, o naghikwa enye nsogbu na ahu. Nchoputa ndi a gosiri, ma kwadokwa na iwedata aka n’itinye nnu na nri na ewetu onuogugu ndi nwere obara mgbali elu.  Ozokwa, o ga-enyekwa aka butuo onuogugu ndi na-aria oria mbammuo na mkpochi obi nke ndi bekee na-akpo “Stroke” na “Heart attack”.

Na nchikota, o di ezigbote mkpa na onye o bula ga-na agba mbo iweda aka n’itinye nnu na nri, ka e nwee ike gbochie obara mgbali elu na oria ndi na-eso ya egbu mmadu.

See summary of the review DACHI See full review on the Cochrane Library DACHI Listen to more podcasts
 

Citation of Review: He FJ, Li JMacGregor GAEffect of longer-term modest salt reduction on blood pressureCochrane Database of Systematic Reviews 2013, Issue 4. Art. No.: CD004937. DOI: 10.1002/14651858.CD004937.pub2.               

 

Translator: Hope Okebalama