Podcast: Early skin-to-skin contact for mothers and their healthy newborn infants - Igbo language translation

Nke a bu okwu ahuike nke sina aka ndi okammuta ana akpo Cochrane gbasara nchoputa ohuru maka ahuike.

N’ oge mbu, ozugbo nwanyi muputara nwa, a na-ekuru ya bu nwa ohuru kusa n’ obi nne ya, ka ahu nne na nwa n’emekota. Ma n’ agba ohuru, e bidoro na-edota nwanyi muru nwa iche, ma dotakwa nwa a amuru ohuru iche, n’ agbanyeghi na odoro anya, na ime nke a nwere ike ibu nmekpa ahu nye nne na nwa a muru ohuru. Ozi a bu maka iji gwa oha na eze na o di nma, nne na nwa ibido nwewa mmekota ahu na oge na dighi aya a mupurara nwa.

Nnyocha ndi okammuta mere gbasara nne na nwa ndi bidoro inwe mmekota ahu site n’ubochi a muputara nwa, na ndi nke e dotara nne na nwa iche iche, gosiri na o diri umuaka ndi ha na nne ha nwere mmekota ahu n’oge nfe ibido nuwa ara. Ozokwa, nnyocha a gosiri na umunwanyi ndi nwere mmekota ahu nne na nwa n’oge na-enwekari ike inye nwa ara, site n’onwa amuputara ha, ruo onwa isii ma karia. Ihe nchoputa a gosikwara na umuntakiri ndi ha na nne ha nwere mmekota ahu n’oge kara nwe nri glucose n’ime ahu ha. Umuntakiri ndi amuru mgbe oge n’eruchabeghi, bukwa ndi ha na nne ha bidoro nwewa mmekota ahu n’oge gosikwara ahu igbasi ike karia ndi nke edotara iche, ma dotakwa nne ha iche

Ihe nnyocha a gbasara uru di n’nne na nwa ibido mmekota ahu n’oge di ire nyere umunwanyi ndi muru nwa ha siririm, ma dikwa ire nyere umunwanyi ndi awara afo kuputanwa ha. Na nchikota, ozi a na-akwado iji mmekota ahu nne na nwa were kwalite agwa inye nwata mmiri ara nne ya. Na ihi na mmiri ara na-enyere umuntakiri aka izere uria, ma nwekwa ahu mgbasike. Ya bu, nne na nwa ibido n’oge nwewa mmekota ahu bu ihe kwesiri ekwesi, n’agbanyeghi ma nwanyi o muru onwe ya nwa, ma a wara ya afo kuputa nwa, ma omuru nwa ya mgbe oge na-eruchabeghi.

Ndi wetere unu okwu ahuike a, bu ndi otu ‘Cochrane’ nke ala anyi bu Naijiria.

See summary of the review

DACHI

See full review on the Cochrane Library

DACHI

Listen to more podcasts

Citation of Review: Moore  ER, Bergman  N, Anderson  GC, Medley  N. Early skin‐to‐skin contact for mothers and their healthy newborn infants. Cochrane Database of Systematic Reviews 2016, Issue 11. Art. No.: CD003519. DOI: 10.1002/14651858.CD003519.pub4.           

 

Translator: Hope Okebalama