Podcast: Antiretrovirals for reducing the risk of mother‐to‐child transmission of HIV infection- Igbo

Antiretrovirals for reducing the risk of mother-child transmission of HIV infection (gw ndi e ji egbochi na z e si ebelata nwa amura ohuru ibute ria mmịnwu, nke a na-akpo HIV na AIDS site n’aka nne ya) - Igbo translation

Nke a bu okwu ahuike nke sina aka ndi okammuta ana akpo Cochrane gbasara nchoputa ohuru maka ahuike.

ria mmịnwu, nke a na-akpo HIV na AIDS, bu nnukwu nsogbu ahu ike nke metutara ma okenye ma nwata na obo anyi bu Naijiria. Imirikiti ụmụaka ndi nwere nje a, nwetara ya site n’ ahu nne ha. Ozi a bụ maka igwa ọhanaeze gbasara ọgwụ ndi na-enye aka igbochi  nwata ibute nje HIV site n’ahu nne ya.

Dika otu mba ụwa n’ahu maka ahuike siri kwuo, n’afo 2009, umuaka ndi n’agafebeghi afo iri na ise, bu ndi nwere nje HIV na Oria AIDS, kariri nde (ma obu million) abuo. Ọtụtụ n’ ime ụmụaka ndia butere ọria a site n’ahu nne ha oge ha di ime ha, ma o bu ọge a na-amuputa ha, ma o bukwanu oge nne ha na-enye ha ara. Ọ bụrụ na enye onye nne nwere nje HIV ọgwụ a e ji ebeleta ọria a oge o di ime, ọ ga-ebeleta ohere nwata nwere iji bute nje HIV site n’ahu nne ya. Ya bu, o di ezigbote mkpa na ụmụnwanyi di ime, ndi nwere nje HIV, ga na-anara ọgwụ a, oge nile maka ahuike na odi mma ha. Nne ibunye nwa nje bu ụzọ kachasi ụmụaka si ebute  nje a. Nchoputa di iche iche nke ndi oka mmuta mere gosiri na inu ọgwụ ndia eji ebeleta Nje oria HIV bụ ụzọ kacha mma e ji egbochi nne ibunye nwa ọria, ma meekwa ka ọnọdụ ọjọọ ọria a ghara ịdịcha ire n’ebe nne na nwa nọ. Ya mere, enwere ike ibeleta nwa ibute ọria a site na ahu nne ya ma ejiri ọgwụ a eji egbochi maobu ebeleta ọria nje HIV. E nwerkwara ike igbochi nje a site na-ichawa afọ kupụta nwa, maọbụkwanụ egbochie nwaanyi inye nwatakiri ara.

Ọ di ezigbo mkpa ka ụmụnwaanyi di ime, mee nyocha ahụ maka nje HIV iji mara ọnọdụ ha                          ma nyekwara onwe ha aka ma gbochiekwa ụmụ ha ibute ọria a.  Otu mba ụwa na-ahu maka ahuike, na govmenti ala anyi bu Naijiria kwadoro ogwua e ji egbochi, ma o bu belata nne ibunye nwa nje oria mminwu, nke a na-akpo HIV.


Ndi wetere unu okwu ahuike a, bu ndi otu ‘Cochrane’ nke ala anyi bu Naijiria.

See summary of the reviewDACHISee full review on the Cochrane LibraryDACHIListen to more podcasts

Citation of Review: Siegfried  N, van der Merwe  L, Brocklehurst  P, Sint  TT. Antiretrovirals for reducing the risk of mother‐to‐child transmission of HIV infection. Cochrane Database of Systematic Reviews 2011, Issue 7. Art. No.: CD003510. DOI: 10.1002/14651858.CD003510.pub3.

 

Translator: Hope Okebalama